All- women band: 'Ndị mmadụ na-ajụ anyị ọ ga-ekwe omume ụmụnwaanyị ịma akụ ngwa egwu'

All- women band: 'Ndị mmadụ na-ajụ anyị ọ ga-ekwe omume ụmụnwaanyị ịma akụ ngwa egwu'

Evelyn Ike na-arụbu ebe a na-ere ngwa egwu tupu ọ bụrụ onye ndu otu egwu ụka ọ bụ naanị ụmụnwaanyị na-agụ ma na-etikwa ngwa egwu.

Dịka o siri kọwaa, o si na ịmụ ka e si akpọ ụbọ akwara were malite ije ya n'iti egwu.

Ya na ndị otu ekwu ya gwara BBC na mkparịtaụka na ihe ọbụla nwaanyị maọbụ onye ọbụla chọrọ ịmụta n'ụwa, na itinye uchu na ya, na onye ahụ ga-amụta ya.

Ịgụ egwu bụ nka e nwere nwoke ma nwaanyị, mana ịkụ ngwa egwu dịka ịgba, ụbọ akwara na ụfọdụ ngwa egwu ndị ọzọ bụ ụmụnwoke na-emekarị ya na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naijria.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: