Kedụ ka-esi amata ezigbo na Adigboroja n'ọrụ?

Osisi ikpe

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Osisi eji achabi ikpe

Aka akparala onye ọkaiwu adigboroja akpọrọ Chris Elisha onye jiri ịbụ ọkaiwu aghọgbu ndị mmadụ kemgbe afọ iri na ise na Lagos.

E jidere ya bụ adigboroja n'ụlọikpe mgbe ọ bịara ikwuchitere onye ndị uweojii nwuchiri ọnụ ya.

Ka-ekpechara ya bụ ikpe, onye ọkaiwu ibe ya chọpụtara na ọbụ adigboroja biara rụọ ya aka n'ihu ma jụwa ya onye ọ bụ.

Mgbe ha na-agbagha ya bụ okwu ka ndị ọkaiwu ndị ọzọ na ndi uweojii bịara tinye ọnụ n'okwu.

Akụkọ na-ekwu na Chris Elisha gwara ha na ọ gụrụ na mahadum di na Ukraine mana edughị ya n'iyi ọrụ dịka onye ọkaikpe.

Onye na-ekwuchitere ndị uweojii ọnụ na Lagos bụ Chike Oti kwuru na Elisha ewepụtaghịnwu asambodo ọbụla gosiri na ọ gụrụ akwukwọ maka ịka ikpe.

BBC Igbo jụrụ onye ama ama n'ighọ ọrụ oyibo na Nigeria, Francis Uka, ka-esi ama onye bụ adigboroja n'ọrụ. Gere ụzọ ise ọ kọwapụtara.

Aha nkeananụānụ,

E tu esi achópúta adigboroja n'ọrụ

BBC Igbo chọpụtakwara n'aka onye ọkaiwu akpọrọ Chigozie Anele ka-esi amata ọkaiwu bụ adigboroja. Gere ya ebe a:

Aha nkeananụānụ,

E tu esi achọputa ọkaiwu adigboroja

Ndị mmadụ na-ekwu maka ya bụ akụkọ n'igwe okwu Twitter: