Obaseki: Kwusinụ ibu egbe ma ụnụ chiwa ehi

Godwin Obaseki

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Obaseki chọrọ ikwusị ndọrọndọrọ di n'etiti ọchị ehi na ndị ọkọ ụgbo na steeti ya.

Onye isi Edo steeti bụ Godwin Obaseki amachiela ichi ehi n'abali nakwa i bu egbe chụ ehị na steetị ahụ.

O kpokọbara kommiti mmadụ ruru asaa na iri n'ime asatọ okpuru ọchịchị ime obodo iji we nyocha ndọrọndọrọ dị n'etiti ndị ọchị ehị na ọkọ ụgbo.

Ndị gụnyere na kọmitị a bụ isi oche okpuru ọchịchị ime obodo, ndị uweojii, ndị ọrụ DSS, na mmadụ anọ ndị obodo nọ na Edo steeti.

Obaseki kwuru,"Otu puru iche gunyere ndị uweojii, ndị agha na ndị nchekwa dị iche iche na steetị ya ga na-agagharị ma na-enyocha ndị ọchị ehi. Onye ọchụ ehị achọputara egbe n'aka ya,a ga-anwụchi ya

ma ya ikpe i bu ngwọ agha maka na ndị ọchị ehị ekwesighị iji egbe ma ha chiwa ehi"

Onyeisi ndị Hausa bi na Edo steeti, Badamasi Saleh nyere ndụmọdụ ka emeputa ụzọ dị mma aga-ejị na-ekpuchi onye ọbụla gbara ama nye ndị nche gbasara ndị ọchị ehị ka aghara ị tufu ndụ ha.

Mana Saleh Bayeri, onyeisi ndị Fulani bi na Jos si na ya bụ iwu amara n'Edo steeti enweghị isi maka na ọkpụkpa nrị ehị anaghị abụkari n'abali, ọ bụ nanị i gagharị agari.

Onye na-ekwuchitere Gọvanọ Edo bụ Cruso Osagie gwara BBC Igbo na ya bụ mmachị bụ nkpebi ehiri aka n'anya were mee. O si na-etinyere ya iji we zọ ndụ ma chekwa akụ na ụba ndị Edo steeti.