Ndị agha e bugala 'Operation Cat race' n'ugwu Hausa

Ndị agha

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ndị agha Naijịrịa na-eme karị emume ngosi ike ma ọbụrụ na okwu ndị aruala

Ọbụzighị ihe ọhụrụ na ndị agha Naijiria na-eji emume ngosi di iche iche eyi ndị arụrụana egwu n'ala Naijirịa.

Ajụjụ ọtụtụ mmadụ na-ajụ bụkwa kedu ihe emume putara ma ihe mere eji nwere aha anụmanị n'eyi egwu mara ha.

Onye agha Naijirịa lagoro ezumike nka akpọrọ Abdusalami Ganiyu gwara BBC na-eweputere ya bụ emume ngosi ike iji we kwado nchekwa ọdịnala.

O sị na ihe ndị a ka-eji mara emume ngosi ike ndị agha Naijịrịa akpọrọ 'operation cat race',nke ebidogoro na Benue,Taraba na mpaghara ugwu Hausa di icheiche.

  • Ndị agha ga-egwunye n'ime obodo ndị ahụ ana-wakpo
  • E nwe nwakpo ọbụla chọrọ ime, ha emenyuọ ya ma chụọ ndị oyi egwu ahụ ezigbo ọsọ, nwude ha ma hanye ha n'aka ndị uweojii
  • Emume ngosi ike a ga-egbochi ndị omekome ọbụla ikpa mkpamkpa n'obodo ahụ
  • A na-ewebata ya maọbụru na nwakpo ahụ ekwezi mmekwata
  • Ọ bughị maka ndi aka ha dị ọcha