Patrice Lumumba: Etu e si gbuo nwamadị a ma weghachịte otu mkpụrụ eze ya

Patrice Lumumba dubara ndị Kongo nweta onwe ha

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Patrice Lumumba dubara ndị Kongo nweta onwe ha

Naanị Eze edo bụ ihe fọọrọ Patrice Lumumba bụ onye du mba Kongo n'agha nnwereonwe dịka a gbagbuchara ya n'afọ 1961 mgbe ndị Belguim na-achị mba ahụ.

E liri ahụ ya n'ala ili nkịtị, gwupụta ya, ma buru ya gaa lie ebe ọzọ. Akụkọ sị na e gwupụtakwara ya ọzọ, gbuo ozu ya na nkenke ma were asiidi gbazee ya.

Kọmishọna ndị uweojii na Belgium bụ Gerard Soete, onye chịkọtara maka mgbaze ozu ya kwetere na ọ bụ were mkpụrụ eze edo ya.

O kwukwara maka mkpụrụ eze nke abụọ na mkpịsị aka ya abụọ mana a chọpụtabeghi ha.

Ugbua e nyeghachịla ezinaụlọ Lumumba mkpụrụ eze edo ya n’emume e mere na Brussel.

Ihe a Soete mere n’iwere anụ ahụ nwamadị a gosiri ụdịrị agwa ndị Europe chịrị Afrịca mgbe ochie na-akpa, nke bụ iwere ihe ha kpachiri n’ike ma welaa ha mba ha.

Mana nke a bụkwa imuchi ihu nke ikpeazụ nye nwoke Belgium hụrụ iro.

N’ajụjụọnụ a gbara Soete n’afọ 1999, ọ kwaara mkpụrụ eze na mkpịsị aka ahụ o were dịka “ọlaedo o ritere n’ịchụ nta”.

Ada Lumumba bụ Juliana na-ajụ sị ma ọ bụkwa ndị mmadụ kpara arụ a.

Ọ jụrụ sị “Kedụ ụdịrị ịkpọ asị nwereike ime ka i mee ihe a?”

“Nke a bụ nkọwa ihe mere n’oge ndị Nazi, i were anụ ahụ mmadụ, nke a bụ mpụ megide mmadụ” ka ọ gwara BBC.

Nkọwa foto,

Ada Gerard Soete gosiri onye ose foto eze edo Lumumba dị n'ime obere igbe n'afọ 2016.

Lumumba ruru n’ọkwa prịam minista mgbe ọ dị afọ iri atọ na anọ. A họpụtara na ngwụcha ọchịchị ndị ọcha, ma bụrụ onyeisi obi ọchịchị mba ahụ nwereonwe ya ọhụrụ.

N’ọnwa Juun afọ 1960, mgbe a na-enyefe ọchịchị, Eze Baudouin nke Belgium toro ọchịchị ndị ọcha nakwa nna nna bụ Leopold II dịka ezi onye ọchịchị. 

Mana o kwughi okwu maka ọtụtụ ndị nwụrụ n’ọchịchị aka ike nna nna ha chịrị mba Kongo.

Mana mgbe Lumumba na-ekwu okwu nke na-esohi n’emume ahụ, ọ katọọrọ ogbugbu nakwa aka ike ndị Belgium ji chịa ha.

Ọ kọwaara ya dịka “ọchịchị mmechu ihu nakwa ịgba ohu, bụ nke e manyere ha n’ike.”

Okwu Lumumba tụrụ ndị Belgium niile n’anya.

O nwetubeghi nwafọ Afrịka si etu a gwa ndị ọcha okwu na mbụ, nke mere ha jiri ụhụta ya dịka mkparị nye Eze ga nakwa gọọmenti Belgium.

Ọtụtụ sị na okwu ahụ Lumumba kwuru bụ itinye aka n’akwụkwọ ọnwụ ya, mana ọnwụ ya dabara n’oge ọgbaghara nakwa ọchịchọ ndị Belgium ịnọgide n’ọchịchị.

A sịkwara na mba Amerịka kpara nkata ọnwụ maka okwu Soviet Union tinyekwara agha ọ na-ebu megide ọchịchị ndị ọchị.

Kedụ etu e si gbuo Patrice Lumumba?

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto,

Patrice Lumumba (R) na onye otu ya Joseph Okito (L) ka a nwuchiri ha n'ọnwa Disemba afọ 1960.

Njem Lumumba, site n’ịbụ praịm minista ruo mgbe e gburu ya erughi ọnwa asaa.

Ngwangwa mba Kongo nwereonwe ha, ọgbaghara dapụtara mgbe Katanga dị na mpaghaghara Ọwụwanyanwụ Kongo chọrọ ikewapụ onwe ha.

Nke a mere Belgium ji zipu ndịagha ha ka a bịa chekwaa ndị obodo ha bi na Kongo, mana ha nọkwa na-akwado ndị Katanga.

A chụpụrụ Lumumba dịka praịm minista, o rughi otu izuụka abụọ onyeisi ndịagha bụ Joseph Mobutu weghara ọchịchị n’ike.

A nwuchiri ma kpọchie Lumumba n’ime ụlọ, ọ gbara ọsọ mana a nwuchiri ọzọ n’ọnwa Disemba 1960.

Gọọmenti mba Belgium sị ka a kpọga ya na Katanga.

Mgbe e bu ya n’ụgbọelu na-aga Katanga n’ọnwa 16 Jenụwarị afọ 1961, e tiri ya. E tikwara ya ihe mgbe o ruru Katanga, ndị ndu Katanga nọ na-atụgharị uche ihe ha ga-eji ya eme.

Ha mechara kpebie iji egbe a gbagbu ya, e ruo n’ụbọchị 17 Jenụwarị, a gbagburu Lumumba na mmadụ abụọ ndị ọzọ.

Soete bụ kọmishọna uweojii na ndị otu ya gara gbabie anụ ahụ ozu Lumumba ma were asiidi gbazee ya bụ nke ọ kọwara dịka “ime njem aga ọkụ ala mmụọ”.

Ihe mere nke a iji mee ka ehichapụ ihe akaebe ọbụla ga-egosi ogbugbu Lumumba, dịka akụkọ si n’akwụkwọ De Wittes a kpọrọ ‘The Assassination of Lumumba”.

N’afọ 1999, dịka afọ iri anọ gachara, Soete pụtara n’ọha kwuo na aka ya dị n’ogbugbu Lumumba ma sị na ọ bụ ya ji mkpụrụ eze edo ya ahụ. Ọ sị na o bekasịrị ozu ahụ ya.  

Ebe foto si, ELLE VERMEERSCH

Nkọwa foto,

Foto si n'aka Godelieve Soete, nke na-egosi mgbe nna ya bụ Gerard Soete na nwanne ya Michel, bụ onye sokwa n'ịgbaze ozu Lumumba.

Arịrịọ mba Belgium rịọrọ

Onye bụ praịm minista mba Belgium n’oge ahụ bụ Louis Michel, rịọrọ ezinaụlọ Lumumba nakwa mba Kongo mgbaghara.

Otu onye ọkammụta Nzogola-Ntalaja gwara BBC na o cheghi na mba Belgium ekwetela na agwa ọjọọ ha kpara n’ọnwụ Lumumba. “Belgium achọghị ịnabata na ọ bụ ha mere ihe a – nke a anaghị eju afọ” ka o kwuru.

Ndị ọkaikpe mba Belgium sị na ogbugbu Lumumba bụ mpụ e mere n’oge agha mana mmadụ ise n’ime iri na abụọ a chọpụtara na aka ha dị na ya anwụọla, ebe nyocha a malitere kamgbe ihe karịrị afọ iri ka na-apụ n’ala.

Nyeghachị eze edo Lumumba a so n’atụmatụ na mbọ ikpe udo n’etiti mba Belgium na DR Kongo maka ihe mere n’oge Belgium na-achị ha nakwa ọnwa Lumumba.

“Nke a bụ otu nzọnye ụkwụ - anyị kwesiri ịgakwu n’ihu, ada ya kwuru.

“Anyị kwesịrị ịnabata akụkọ anyị - ma nke ọma na nke ọjọọ.”

A ga-eli eze ahụ n’ụbọchị a ga-eme emume ncheta okwu nwereonwe Lumumba kwuru nke afọ iri isii na otu (61yrs).