Ụdị ‘structure’ m chere Peter Obi kwesịrị inwe tupu ọ chọwa ịbụ onyeisiala - Ned Nwoko

Aha onyonyo,

Ụdị ‘Structure’ m chere Peter Obi kwesịrị inwe tupu ọ chọwa ịbụ onyeisiala - Ned Nwoko

Ned Nwoko na Peter Obi

Ned Nwoko bụ onye ndọrọndọrọọchịchị na ojiegoachụego akọwarala BBC Igbo ihe o chere maka okwu ọtụtụ mmadụ kpụ ọnụ ugbua bụ 'structure' Peter Obi kwesịrị inwe tupu o chee ịbụ onyeisiala Naịjirịa.

O kwukwara na o so kwadokwa nloghachite Peter Obi na People's Democratic Party - PDP.

Ọkparaeze Nwoko gara ihu kọwaa ihe 'structure' a na-ele anya pụtara.

Ọ si na structure pụtara ndị niile ga-emejupụta ndị gọvanọ, ndị ụlọomeiwu ụkwụ ma nta. N'uche ya, ọ bụ ndị a niile ga-eme ka ọchịchị ya pụta ihe.