Etu osisi Okporiama si ekpere ndị obodo Amaozalla ikpe

Eusebius Oyigbo bụ onye obodo Amaozalla ma bụrụ kwa onyeisi ọgbakọ ndị Amaozalla Affa kọwara etu osisi Okporiama si ekpere ha ikpe.

Oyigbo kwuru na anaghị asị asị n'ala Okporiama ma sị na anaghị kwa eji ọgwụ abata ala Okporiama.

O kwuru sị, " Ala Okporiama Uvurano bụ ala arụsị na enweghị onye na-eleta ya anya. Ọ bụ ihe nna nna anyị ha mere ma guzobe".

A na-agbapụ akpụ ụkwụ ma ịbịa Osisi Okporiama iji gosi na ọ bụ ala nsọ ma bụrụ kwa ebe ị ga-ekwu eziokwu.

Oyigbo kọwara etu osisi Okporiama siri chụọ ndị mmadụ ọsọ mgbe ha bịara ikpe ikpe gbasara eze ala ha n'afọ 2021.

O kwuru sị, " Mgbe ndị tigbuo zọgbuo bidoro ikwu okwu, osisi Okporiama chụsara mmadụ niile nọ ebe ahụ.

Ihe onyonyo a kọwara n'uju etu osisi Okporiama siri mee ihe ndị mmadụ na-akpọ ihe iribeama nakwa ihe ndị sayensi nwere ikwu maka ihe mere.