Alexis Sanchez agaghị aga mkpọrọ maka nrụrụaka ụtụisi

Alexis Sanchez Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Alexis Sanchez si otu Arsenal gafee Manchester United n'ọnwa Jenụwarị 2018

Alexis Sanchez na-agbara Manchester United bọọlụ anabatala mbuli ikpe ịga mkpọrọ ọnwa iri na isii amanyere ya maka nrụrụaka ụtụisi, nke ga-eme ka ọ hapụ ịpụta ebe a ga-ekpe ya ikpe.

Sanchez gbabuuru otu Barcelona bọọlụ kaara ịga n'ihu ikpe na mba Spain maka ụtụisi ọ na-akwụghị ụgwọ ya oge ọ bi ebe ahụ, nke ruru otu nde Euro (one million Euro).

Ụtụisi a si n'ime ụgwọ akwụrụ ya maka eserese ya na 2012 na 2013.

Ka eboro Sanchez dị afọ iri abụọ na itoolu ebubo a n'afọ 2016, onye ojeozi ya kwuru sị na "orubereisi ọfụma ma kwuputekwa ego ole onwetere maka eserese ya"

A na-anụ kepukepu na Sanchez si Manchester United gafee Arsenal n'ọnwa Jenụwarị bụ onye egwuregwu bọọlụ akacha akwụ ụgwọ na Premier League, ebe ọ bụ na ọ na-erite pọụnd nde iri na anọ n'ime otu afọ ma ọ tụchaa ụtụisi.

Odịrị ihe a omeela ndị ọzọ?

Sanchez so n'otu n'ime ndị egwuregwu bọọlụ gbagolitere elu aka na-akpara maka ihe gbasara ụtụisi na mba Spain.

N'ọnwa Jenụwarị, Luka Modric bụ onye na-agbara otu Real Madrid bọọlụ, kwụrụ ndị na-ahụ maka ego na mba Spain ihe ruru otu nde Euro iji mechie ihe gbasara ụtụisi eserese nke ya.

Lionel Messi na-agbara Barcelona na Cristiano Ronaldo na-agbara Real Madrid enwekwaala ọdịrị nsogbu a n'afọ ole na ole gara-aga.