Arsene Wenger ekwuola na ndị egwuregwu England dị aghụghọ

Arsene Wenger Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Arsene Wenger achịala otu Arsenal kemgbe afọ 1996

Arsene Wenger bụ onye nchịkọta otu Arsenal ekwuola na ndị egwuregwu bọọlụ si England nwere ike ịbụ 'nnaukwu' n'ịghọ aghụghọ.

Enyere Dele Alli na-agbara Tottenham bọọlụ, akwụkwọ edo edo maka ịghọ aghụghọ ịma afọ n'ala ka ha na Liverpool sọrọ mpi n'ụbọchị Sụnde gara aga.

Virgil van Dijk na-agbara Liverpool bọọlụ bokwara onye otu Alli bụ Harry Kane ebubo ịma afọ n'ala ka ha ji ya nweta penaliti.

Wenger kwuru sị: "Echetara m na-enwere ụfọdụ ọmụmatụ oge ndị egwuregwu si esi bata mere ya, mana ndị egwuregwu si England amụtala yabụ ihe ọsịsọ nke pụtara na ha nwere ike ịbụ nnaukwu ugbua."

Na Nọvemba, Wenger kwuru sị na Raheem Sterling "ma etu esi ama afọ n'ala ọfụma" ka Manchester City merichara Arsenal 3-1.

Ihe Wenger kwuru

Wenger, onye ndị otu ya ga-eso Tottenham asọ mpi na Premier League nke Satọde na Wembley, kwuru sị: "Anaghị m agwa ndị otu egwuregwu m ka ha ghọọ aghụghọ imado afọ n'ala ma ọlị. Anyị ga-agba mbọ hụ na anyị wepụrụ ụdị aghụghọ a n'egwuregwu a.

"Oge ụfọdụ ndị egwuregwu na-agbagha iwu etinyere. Kedụ ebe ị ga-erunwu? Nke ahụ dị n'aka ndị referii."

Na Tọọsde, onye nchịkọta Tottenham bụ Mauricio Pochettino kwuru sị na ịma afọ n'ala bụ "obere okwu" na bọọlụ, na ịghọgbu onye gị na ya so asọ mpi sozi n'egwuregwu bọọlụ.

N'afọ a, ndị Football Association (FA) wepụtara iwu ọhụrụ nke ga-amachi onye ọbụla ịma afọ n'ala.

Ndị kọmitii ewepụtara ga-etinye anya n'aghụghọ ndị egwuregwu, ebe ha ga-atule ihe nkiri ụbọchị Mọnde ọbụla. Onye egwuregwu ọbụla achọtara ihe n'aka ya ga-ala ezumiike.

Ndị iwu a metụtara

N'Oktoba, Shaun Miller na-agbara Carlisle United bọọlụ bụ onye mbụ amachiri ịsọ mpi bọọlụ ugboro abụọ.

Oumar Niasse n'agbara Everton bọọlụ bụ onye egwuregwu Premier League mbụ achụlara ezumiike -maka asọ mpi bọọlụ ugboro abụọ- na Nọvemba.

A chụlara Niasse dị afọ iri abụọ na asaa maka ihe o mere ka ha na ndị otu Crystal Palace gbara 2-2.

E nyere ha penaliti ka ha kpebiri na Scott Dann gbaturu ya.

Leighton Baines gbakpuru penaliti na goolu ebe Niasse mechara nye goolu mere ka Everton nwete otu pọintị.

Na afọ 2012, Michael Owen bụ onye gbabuuru England bọọlụ tara "mmetụta ndị egwuregwu bọọlụ si South America, Spain and Italy" ụta maka aghụghọ ịma afọ n'ala dị n'ime egwuregwu bọọlụ England.

Isiokwu Ndị Emetụtara