Nigeria enwetala ọlaedọ abụọ n'ụbọchị mbụ

Ebe foto si, Emeka Dennar
Ukoro Peter ji ọlaedo kpọọ Nigeria ihu oma n'ụbọchị mbụ nke African Wrestling Championship
Nwa afọ Naijiria bụ Ukoro Peter emela ihe ịtunanya site na ịgbatara Nigeria ọlaedọ na mgba nke ndị ndị 55kg mgba Greco-Roman n'ụbọchị mbụ ebidoro mmememe egwuruegwu ahụ na Port Harcourt.
Nwa amadị ahụ si Bauchi Steeti ji ọkpụ anọ meriri Omar Adel Abdelazi nke Egypt mgbe oge ha zuru.
Ukoro siri na "obi dị m ụto maka mmeri a m meriri".
"Mgba Greco-Roman na-eme m obi ụtọ. N'ike nke Chukwu aga m abụ ọkachakacha na mgba a."
Lu Shawn Leonico nke South Africa ritera bronze ka o ji ọkpụ anọ merie Linus Katujanda nke Namibia.
N'otu aka ahụ, nwa afọ Igbo bụ Ikechukwu Robinson ritere bronze ka o merichara Medhi Dheker nke Tunisia nke o jiri ọkpụ asatọ chara acha were merie na ọgbọ nke 60kg .
Onye ritere ọlaedo nke ọgbọ ahụ bụ Ahmed Merikhi nke Algeria onye ji ọkpụ asatọ asatara atọ merie Zeyad Emadeldin Helmi Yakout nke Egypt.
Na nke ụmụnwaanyị, Sunmisola Balogun dere aha ya n'ọlaedọ site na itigbu Natasha Nabaina nke Cameroun n'ọgbọ 65kg.
O ji ọkpụ ise asatara anọ were nyụọ ya ịkpakwụ ma nwetere Naijiria ọlaedo nke abụọ.
Akụkọ a ka na- abia...