Lagos City Marathon: Abraham Kiprotich emeriela

Ndị so gbaa ọsọ
Nkenke aha onyonyo Ma onye ukwu, ma onye nta so gbaa ọsọ a

Ka ọ kwadoro inye ndị meriri n'ọsọ a ihe nrite, Gọvanọ Lagos bụ Akinwunmi Ambode kwuru sị "ike agwụla anyị inye ndị si n'ọwụwa-anyanwụ Afrịka ihe nrite a.

"Anyị ga-ebido itinye uju n'ịzụ ndị Naịjirịa ka ha nwee ike imerinwu maratọn."

Kemgbe ebidoro ịgba ọsọ Lagos City Marathon afọ atọ gara aga, ọ bụ ndị sị ọwụwa-anyanwụ Afrịka na-emeri.

Ihe ruru mmadụ puku otu narị sonyere na-ịgba ọsọ Lagos City Marathon nke 2018 nke bidoro ụzọ ụtụtụ taa.

Ndị mmadụ bidoro ịhapụwa ụlọ ha ebe elekere ise nke ụtụtụ, ebe ụfọdụ pụtara ka ndị ọsọ na-agbafe n'agbataobi ha.

Lekwa ihe ndị pụrụiche BBC hụrụ:

Nkenke aha onyonyo Nwaanyị yi uwe ndị Hausa a na-akpọ Hijab sokwa gba ọsọ a
Nkenke aha onyonyo Ụfọdụ na-achọghị ịgba ọsọ ji ịnyịnya igwe ha sonye
Nkenke aha onyonyo Ụfọdụ ndị nwere ọlụsị sonyekwara
Nkenke aha onyonyo Ụfọdụ ndị ọcha sokwa gbaa ya bụ ọsọ
Nkenke aha onyonyo Ụfọdụ ndị wepụtara onwe ha maka inyere ndị ihe merụrụ ahụ aka
Nkenke aha onyonyo Otu onye so agba ọsọ kwụsịrị izu ike
Nkenke aha onyonyo Okocha gbaburu Naịjirịa bọọlụ sokwa gbaa ya bụ ọsọ

Isiokwu Ndị Emetụtara