Jose Mourinho ekwuola n'okwesịrị inweta ihe nrite

Jose Mourinho Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Achụpụla Jose Mourinho bụ onye nchịkọta Manchester United n'ọgbọ egwuregwu ihe ruru ugboro asaa kemgbe o ji bịa ọrụ na England

Onye nchịkọta otu Manchester United bụ Jose Mourinho ekwuola na o kwesịrị inweta ihe nrite maka na akparamagwa ya agbanweela.

Okwuru sị na o sitere n'ịbụ onye a na-amakarị ikpe ma chụpụ n'akụkụ ọgbọ egwuregwu, bụrụzịa onye a na-anaghị achụpụ (ikpeazụ achụpụrụ ya bụ Septemba 23 nke 2017).

Mourinho kwuru sị na ọbụzị otu n'ime ndị nchịkọta na-akpa agwa ọfụma n'ime Premier League.

"E kpebiela m na m ga-agba mbọ inweta ihe nrite a na-enye onye nchịkọta kacha kpaa agwa ọfụma n'ọgbọ egwuregwu,

"A naghị m egwu egwu - akwadoro m onwe m, obi dị m ụtọ nke ukwuu. Atọhapụchabeghi m onwe m n'iwe oke iwe, ịchịkwa onwe m, n'ime otu egwuregwu. Ezuchaghị m oke.

"Enwere ihe nrite buru ibu - onye kacha mee ọfụma n'izu, onye nchịkọta nke ọnwa, nke a na nke ọzọ - ha were otu nye onye kacha kpaa agwa ọfụma n'ọgbọ egwuregwu.

Ha mekwaa ka ọ bụrụ refrii nke anọ ga-ebinyeaka. Obi kara m na aga m emeri."

Isiokwu Ndị Emetụtara