Conte ọ ka ga-enwe ọrụ ma Chelsea na West Brom gbachaa?

Conte ka nwere olileanya ma o siri otu a gawa
Chelea na West Brom na akwarita ya na abalị. Egwuruegwu ga ekwu ma Conte a ga a nọ na Chelsea ka ọ ga ala.
Ọ bụru na-emerie Chelsea, ọ burụ ụgboro atọ a ga emerie ya n'otu aghịrị.
Nke mee ọ ga ahiaahụ Conte ị nọrọ dị ka onye nkuzi ndị chelea. Mana ọ bụru n'omerie n'abalị a, ị mara na Chi ya agbara ya ọgụ.
Ka ọ dị ụgbụa Chelea ji otu ọkpụ (1-0) emeri West Brom agbanyeghị na Olivier Giroud meruru ahụ n'isi.
Egwuruegwu agafeela ezumike (Half time), Chelsea ka jị otu ọkpụ emeri West Brom ndị na-agba ọnwu ọnwụ nke mere ka enye Evan onye otu ha akwụkwọ edo bekee kpọro yellow card.
Ka ha si jide bọlụ
Chelsea 56%
West Brom 44%
Ọ bụrụ na ọ dịrị otu a gawa mara na Conte ka nwere ike ị jide ọrụ ya.
Chelsea e mezuola ya ọkpụ abụọ (2-1)
Moses nyere ya na nkeji iri isii na atọ (63') ebe E Harzard nyere nke mbụ na nkeji iri abụọ na ise (25').
Goooolu!
Chelsea enyela nke atọ (3-0)
E Harzard a gwala Conte ya ekubila.
Na nkeji iri asaa (71') na otu ka o ji nye ya bụ golụ.
Akụkọ a ka na ag n'ihu.