South Africa: ANC 'si na Zuma ga ala'

Jacob Zuma Image copyright Getty Images

Onye ode akwụkwọ ANC bụ Ace Magashule sị na nkwekọrita ndị pati ha nwere "e wepụ Zuma n'ọkwa" bu nke ha rụtere ka ha kpachara nnukwu nkata.

Mana, Mgashule si na ha ekpebibeghị mgbe Zuma ga apụ, na ekwukwa na ha ekweghị n'ihe Zuma sị, nke bu ka enye ya ọnwa atọ ma ọbụ isii ka o ji pụọ.

Okwu Mgashule danyere na nke ndị nta akụkọ na Saut Afịrịka kwuru n'ụtụtụ taa.

Akukọ a akọro maka "ikpọghachi" Zuma soro nkata dị icheiche ndị onu na atụ nkụ na ANC na Zuma nwere kemgbe ụnyahụ.

Ya bụrụ na Zuma, di afọ 75, ekweghị ịpụ, a ga eme ntule aka a ga eji chụpụ ya.

Zuma nọ n'ọkwa kemgbe afọ 2009, mana ebubo mpụ nọ n'eso ya.

ANC ekwugbeghị ọzọ ha chọrọ iso, mana ndị ma ihe n'aga na pati ahụ kọwarụ ndị nta akụkọ na Saut Afịrịka nakwa Reuters.

Zuma ekweghị kemgbe Decemba a na asị ya rituo. Ọ na Decemba ka Cyril Ramaphosa nọchiri ya ka onyeisi ANC.

Amabeghi etu Zuma ga eji sa aririo a na ario ya ka ọpụọ. A ga ezigara ya akwụkwọ taa.

N'ọnụ ụtụtụ taa, Ramaphosa rapụrụ ebe a na-eme nzụkọ ANC gawa be Zuma, ebe a sị na ọ gwara onyeisiala na aga achupu ha ma yabụrụ na ojighi aka ya rituo.

Ramaphosa mechara lahachi ebe ANC na eme nzụkọ.