Etu eji wepụta nka Obama na Michelle nwaafọ Naịjirịa sere

Obama na Michelle Image copyright Getty Images

Onye bụbụ onyeisiala Amerịka bu Barak Obama na nwunye ya bụ Michelle apụtala na nka nwaafọ Naịjirịa bụ Kehinde Wiley nakwa Amy Sherald bụ onye isi ojii sere ha.

Obama na nwunye ya bịara na ebe egosiri ọha foto ndị a.

Image copyright Getty Images

Ọ bụ ebe a na-akpọ Smithsonian National Portrait Gallery di na Washington DC ka emere ngosi a.

Mazi Obama si na ya bụ ihe osise di "nkụ", nwunye ya na onwe ya tiri 'wow'.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Kehinde Wiley na Amy Sherald

Ndị mmadụ mabụ Wiley (nna ya bụ onye Yoruba) maka ụdiri osise o na eji ndị isi ojii Amerịka emebụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nna Kehinde Wiley bụ onye Yoruba

Nke a bụ mbụ ndị osise isi ojii na ese onyeisiala mba Amerịka akwadọro site na gọọmentị.

Obama kenere Sherald maka etu o si see nwunye ya bụ Michelle.

Wiley na onwe ya sị n'onweghị ihe ga eme ka ọhapụ ohere onwetere ibụ onye isi ojii mbụ gọọmentị nyere nkwadọ ise onye bụ onye isi ojii mbụ chiri Amerịka.

Ndị mmadu na-ekwu maka foto osese a na nta akuko ọhụrụ bụ social media.

Onwere ndị sị na foto Obama gosiri ebe ọ nọ na ụgbọ hiri nke Beyonce.

Ndị ọzọ si na ọ ihe nkiri onyonyo "The Simpsons" ka onye osise a nwetere echiche o ji see ihe a.

Mana ha na eto Wiley ọfụma na asị na nka ya gbagotere.

Mana, onwere ndị ọzọ na atụ aka na nke Michelle eghighi ya cha.

Isiokwu Ndị Emetụtara