Asọmpi Uefa Champions dịka o sị a da

Asọmpi Uefa Champions bụ nke jịkọtara otu egwuregwu bọọlụ dị na mba ndị Europe nille. Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Asọmpi Uefa Champions bụ nke jịkọtara otu egwuregwu bọọlụ dị na mba ndị Europe nille.

Ndị hụrụ egwuregwu bọọlụ n'anya na-echere ihe ga-eme n'ọgbọ egwuregwu bọọlụ ụfọdụ dị na mba ndị Europe n'abalị a.

N'asọmpị iko Champions League nke taa, FC Porta na Liverpool ga-anwale ike ha na 8:45 nke abalị taa.

Asọmpị nke ọzọ ga-eme taa bu Real Madrid na Paris Saint-Germain ga emekwa na 8:45 nke abalị a.

Gịnị nwere ike ị me?

Onye ọka ekwu n'ihe gbasara egwuregwu bọọlụ bụ Emeka Ofor gwara BBC Igbo n'asọmpị nke taa gaadị ezigbo ọkụ.

"Onweghị onye mara ihe ga-eme n'asọmpị FC Porto na Liverpool taa. Makana Liverpool na-agba dịka ndị ụkwụ ha esịghị ike n'ala. Mana ọtụtụ mmadụ na-akwado ndị Liverpool na asompị nke taa."

"Ndi m na-atụ anya ime nkeọma n'egwuregwu nke taa n'ime otu Liverpool bụ Mohammed Salah, Emri Chan na Roberto Femino," Ofor kwuru.

O kwukwara na, "N'ime otu FC Porto bụ ndị dịka Danilo Pereira na Iker Casillas".

Asọmpi dịka ọka ibe

Mana ọ dị ka na asọmpị nke ndị Real Madrid na Paris Saint Germain bụ nke ga-akachasị kpụrụ ọkụ n'ọnụ.

Maazi Ofor kwuru na asọmpị nke a 'ga-ebụ nnukwu mgbọ!'

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ronaldo bụ onye ụkwụ kacha aghọ nkọ n'otu Real Madrid

Ofor kwuru si: "Anyi ga-ahụ Christiano Ronaldo onye otu Real Madrid na Neymar onye otu PSG. Mana ọ dịka anya onye ọ bụla dị n'ebe Neymar nọ,"

Ọ gakwara n'iru kwuo: "Neymar bụ onye kachasị obere n'afọ. Ihe a mere ka ọ dị ezigbo ọkụ na asọmpị ha niile. Ronaldo ka dị ọkụ mana ọgbagola n'afọ . Ihe a nyere onye dika Neymar ohere."