Onye Naịjirịa ekperela azụ n'ọsọ skeleton na South Korea

Simidele Adeagbo Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Simidele Adeagbo gụrụ maka ntaakụkọ na mahadum

Nwaafọ Naịjirịa bụ Simidele Adeagbo ekperela azụ n'ọsọ nkwado skeleton nke wịnta olimpiks a na-eme na South Korea.

Adeagbo kpetere azụ n'ọsọ nkwado abụọ agbara n'asọmpi skeleton ụbọchị Fraide.

O ji ihe karịrị ntabianya abụọ na ọkara ghara ịgbada ugwu n'elu efere igwe karịa onye gbakarịchara ọsọ na nkwado ahụ bụ Lizzy Yarnold, onye Britain.

Yarnold gbazuru nke ya n'ime ntabianya 51.66.

Mana Adeagbo - onye Naịjirịa nke mbụ n' asọmpi na wịnta olimpiks - anaghị ekwe ya kpasuo ya iwe.

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Simidele Adeagbo malitere ịgba ọsọ skeleton n'ime ọnwa anọ gara aga

Nick Hope bụ onye BBC dere n'igwe okwu Twitter:

Hope kwukwara na onwetere nkwado si n'ụlọ nke si n'aka ndị Naịjirịa ibe ya so asọmpi.

Isiokwu Ndị Emetụtara