Sergio Arguero na ndị otimkpu Wigan kwakọrọ isi ụnyaahụ

Arguero na-akwa otu onye otimkpu Wigan aka Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nke a bụ ụgboro ise ndị Wigan na-emeri Manchester city

Ndị otimkpu otu egwuregwu bọọlụ Wigan mebiri ihe unyaahụ mgbe otu ha ji otu ọkpụ bọọlụ merie Manchester City n'asọmpị FA cup.

Ha gbabara n'ime ama bọọlụ na-akwatu ịhe dị ịcheịche na-ebute ogbaaghara ebe ndị otu ndị ọzọ nọ, ọ nwere otu n'ime ha gara ị kparị Sergio Arguero onye ogba bọọlụ Manchester City.

Nke a mere na eji ndị nche dupu ndị otu Manchester city ka ha ghara ịmerụ ahụ na nsogbu a.

Will Grigg nke ndị Wigan nyere ọkpụ goolu ha ji merie asọmpị nke a n'elekere iri asaa n'itoolu.

Isiokwu Ndị Emetụtara