Nwa dike na bọọlụ bụ Didier Drogba esonyela otu Guingamp

Isaac Drogba nwa Didier Drogba Image copyright Guingamp
Nkenke aha onyonyo Isaac Drogba chọrọ ịgbachitere ndị England bọọlụ n'ogo mbaụwa

Isaac dị afọ 17 bụ nwa onye gbaburu Chelsea bọọlụ bụ Didier Drogba esonyela otu Guingamp.

Isaac Drogba bụ onye goolu dịka nna ya, gbabuuru ụlọnkuzi bọọlụ Chelsea.

Ọ na-agafe Guingamp ka afọ 16 gachara oge nna ya binyere aka isi otu Le Mans gafee Guingamp ka ha kwụchara £80,000 iji gote ya.

Didier Drogba nyere goolu 24 ugboro 50 ọ gbaara ndị Guingamp bọọlụ, dere n'igwe okwu Instagram sị "M na-anya isi maka gị Isaac Drogba"

Mmadụ abụọ ha na Drogba gbakọrọ bọọlụ na Chelsea so na ndị sara ihe o dere.

Frank Lampard dere sị "Ndeewo! Echetara m Isaac dịka nwantakịrị ahụ na-akwanye ugwu! Ugbua ị bụ dimkpa!"

John Terry dere sị "Enweghị m ike ikweta etu ọ ha na nnukwu ugbua, ndeewo o."

Didier Drogba anọzughị afọ abụọ na Stade de Roudourou nke ndị otu Guingamp, tupu ọ gafee Marseille ebe ọ nọrọ otu afọ tupu o sonye Chelsea n'afọ 2004.

O mechara bulie iko Premier League ugboro anọ, iko FA ugboro anọ na iko Champions League, ma gbakwara ndị Ivory Coast ugboro 104.

Oge agbara ya ajụjụ ọnụ n'afọ 2015, Drogba kwuru na nwa ya nwoke ọ mụrụ oge ọ na-agba na France, chọrọ ịgbara ndị England bọọlụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara