Ihe ga-eme n'asọmpi Champions League taa

Chelsea na Barcelona Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Otu Chelsea meriri Barcelona iji garuo na ngwụcha asọmpi champions league ebe ha meriri Bayern Munich wee bulie iko n'afọ 2012

Otu onye ọnụ na-eru n'okwu bụ Emeka Offor ekwuola ihe ga-eme ma Chelsea na Barcelona zukọọ ịsọmpi Champions League na Stamford Bridge taa.

Offor kwuru sị na a na-atụ anya na Barcelona a na-emeribeghị n'ime asọmpi 31 ha gbarala n'asọmpi La Liga, ga-eme ọfụma ma ha na Chelsea zukọọ n'abalị a.

O kwukwara na agaghị elelị Chelsea anya n'agbanyeghị na ha meriri nanị asọmpi anọ n'ime 12 ha gbarala n'izu ndị garaaga.

Offor sị na ọ bụ "nanị Chelsea bụ otu si n'England na-ara Barcelona nsogbu ma ha zukọọ n'ọgbọ egwuregwu.

"N'ọnwa Jenụwarị, otu abụọ a zụtachara ndị ma-agba bọọlụ ọfụma, Barcelona zụtara Coutinho mana ọgaghị eso ha asọmpi a. Hazard na Willian mere ọfụma n'asọmpi ha ka gbachara.

"Ihe m na-ekwu bụ sị elelịla Chelsea anya maka na ha nwere ike ịbụ ndị mmeri taa."

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Onye egwu ndị Barcelona bụ Leo Messi enyebeghị goolu n'ime ugboro asatọ ha na Chelsea zukọrọ

Maka asọmpi Bayern Munich na Besiktas, Offor kwuru sị "Bayern Munich meriri asọmpi 13 ha gbarala n'izu ndị garaaga. Ha ji pọịntị 21 aga ndị ọzọ na Bundesliga. Ọ bụghị ihe ọtụtụ okwu, ha ga-emeri Besiktas."

Nanị otu Bayern Munich na Besiktas bụ otu abụọ nọ na-agba nke 16 bụ ndị buliri iko League ha n'afọ garaaga.

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a