Ronaldo, Bale na Benzema tunyere aka wee merie Alaves

Cristiano Ronaldo Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Agbanyeghị na agbara Ronaldo ukwu, onyere golu abụọ na asọmpị a

Onye Portugal na gbara Real Madrid bọlụ bụ Cristiano Ronaldo na ndị otu ya bụ Gareth Bale na Karim Benzema nyere golu na mmeri 4-0 ha nyere otu egwuregwu bọlụ Alaves n'asọmpị ha sọrọ na Satụde.

Mmeri a mere ka Real Madrid jiri pọint anọ kwụrụ n'azụ Atletico Madrd.

Asọmpị bu nke mbụ Ronaldo na-agba ka a sị ya zuo ike ka Madrid na otu egwuregwu Leganes gbara bọọlụ na Wenesde.

Ọ Ronaldo bu ụzọ nye goolu na asọmpị a ka ọ tụtụrụ bọọlụ Benzema nyere ya wee nye goolu.

Benzema na onwe ya no na isi goolu abụọ Madrid nyer.

Goolu abụọ a biara na n'ime otu nkeji eji banye ọkara abụo. Benzema, bụ nwafọ France, wetara bọọlụ n'etiti ama wee gbapu gawa na ọnụ goolu ndị Alaves ebe Bale nwere ya tinye n'ime ọnu goolu ndị Alaves.

Ronaldo nyere goolu atọ ndị Real Madrid na njeki 61. Nke a bụ goolu 299 onyere kemgbe ọ bịra La Liga.

Benzema mechiri akwukwọ ka asọmpị a na-abịa na-ngwụcha.

Isiokwu Ndị Emetụtara