Lai Mohammed: Ọ bụ Ụmụakwụkwọ 110 na-efu n'obodo Dapchi

Ụmụ akwụkwọ Dapchi Image copyright Yobe State Government

Lai Mohammed ekwuola na ọ bụ ụmụagbọghọ 110 na-efu n'ụlọakwụkwọ Government Science and Technical College dị na Dapchi, Yobe State.

Ka otu izu na-achọ ịgafe ka ndị Boko Haram wakporo obodo Dapchi dị na Yobe steeti, gọọmentị Naịjirịa ekwuputala na ọ bụ ụmụakwụkwọ 110 ka a tọrọla n'ụbọchị Mọnde ahụ.

Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi Lai Mohammed, depụtara akwụkwọ nkwuputa ebe ọ kpọpụtara ọnụọgụgụ mmadụ ole na-efu ka ọ gara Yobe steeti ọzọ taa.

O kwuru: "Anyị nọ na Yobe steeti ebe anyị na-agba mbọ imeda obi nne na nna ụmụagbọghọ ndị ahụ, ime ka ha mara na ọbụghị nanị ha kwụ, imekwa ka ha mara na anyị agaghị ezu ike ruo mgbe achọtara ụmụaka ahụ. Anyị ga na-ebu nne na nna ndị a n'ihe niile anyị na-eme gbasara ya."

Mohammed kwuputara nke a na nzukọ ya na ndị gọọmentị etiti, gọọmentị Yobe, ụlọakwụkwọ ahụ, ndị nne na nna, ndị nchekwa na ndị gọọmentị ọchịchị obodo Bursari ebe Dapchi dị, nwere na Damaturu taa.

O kwuru n'onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ bụ Adama Abdulkarim na Mohammed Lamin bụ kọmishọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ na Yobe gwara ya na ụmụakwụkwọ 906 nọ n'ụlọakwụkwọ ahụ ụbọchị awakporo ha

Nke a na-abịa ka nne na nna ụmụagbọghọ a depụtara aha mmadụ 105 na-efu.