Carabao: Guardiola ebuliela iko ya nke mbụ n'England

Guardiola ebuliela iko Carabao

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Nke abụ iko nke mbụ Guardiola na-ebute n'ime afọ abụọ o bidoro ịrụ ọrụ nchịkọta n'England

Manchester City gbara Arsenal 3-0 iji bulie iko Carabao nke bụ iko mbụ onye nchịkọta ha bụ Pep Guardiola na-erite n'England.

Onye goolu Sergio Aguero, bu ụzọ nye goolu tupu Vincent Kompany agbazuo ya abụọ.

David Silva gbazuru ya atọ, nke mere ka ọ bụrụ mmeri Arsenal karịchara nweta n'egwuregwu ngwụcha (cup final).

Aguero nyechara goolu ugboro ise ikpeazụ ya na Arsenal zukọrọ n'asọmpi egwuregwu.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Guardiola enwetala ihe nrite "onye nchịkọta kacha mma" nke ndị UEFA ugboro abụọ

Iko Carabao a bụ nanị iko nkeụlọ Arsene Wenger bụ onye nchịkọta Arsenal na-ebutebeghị kamgbe afọ 21 o bidoro ịchị Arsenal.

Mbuli iko a mere ka iko Guardiola butegoro n'ọrụ ya dị ka onye nchịkọta ruo 22.

Ndị ọzọ bụ ndị o buliri oge ọ na-achịkọta Barcelona na Bayern Munich.

Arsenal na Manchester City ga-ezukọ ọzọ n'ime izu a (ụbọchị Tọọsde bụ Maachị 1) ịsọmpi nke Premier League.