Ụkwụ Neymar rọjiri akụpụọla ya n'asọmpị na-abịa

Neymar da Silva Santos Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo PSG ji nde dọla nari abụọ zụụ Neymar n'afọ 2017

Neymar da Silva Santos bụ onye egwuregwu bọọlụ otu Paris St-Germain agaghị eso n'asọmụnpị Paris St-Germain na Real Madrid n'iko Champions League maka omerụrụ ahụ n'ụkwụ.

Neymar dị afọ iri abụọ na isii merụrụ ahu n'ogweụkwụ n'ụbọchị ụka n'asọmpị Paris St-Germain na Marseille.

Ndị dokinta ekwubeghị oge Neymar ga-agbake.

Neymar ba otu PSG n'ọnwa August n'afọ 2017, o nyere goolu ruru iri abụọ na itoolu n'ime asọmpị iri atọ.

Ugbua PSG ji akara iri anọ karị Monaco.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara