Chinedu Ọbasi a gaala Bolton Wanderers

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Chinedu Obasi so ndị bọọlụ Naịjiria nwetere ọra ọcha na Beijing Olympics

Nwaafọ Naịjirịa bụ Chinedu Ọbasi a bịanyela aka n'akwụkwọ iji gbara otu Bolton Wanderers bọọlụ ruo ngwucha afọ a, nke bụ 'Season' na bekee.

Obasi dị afọ 32, na nsonso a, ọ gbaara ndị otu egwuruegwu bọọlụ AIK nke Sweden bọọlụ.

Tupu ọ gawa Sweden, Obasi gbara Sven Goran Eriksson bọọlụ na otu egwuruegwu bọọlụ Shenzhen nke China.

Obasi mere ya onye nke abụọ Bolton na-akpọta n'ime izu ụka abụọ ka Jan Kirchhoff banyere Bolton n'ụbọchị 22 nke ọnwa Febụwarị n'afọ a.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara