Manchester City emeriela Chelsea 1 - 0

Manchester City na Chelsea Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Bernado Silva e nyela golu abuo na egwuruegwu bọlụ ha gbagoro n'izuuka abuo gara aga

N'egwuruegwu ndị Manchester City and Chelsea gbabiri na abali a, ndị Manchester City ji otu ọkpụ merie ndị chelsea na ọgbọ egwuruegwu Etihad.

Ọ bụ Bernardo Silva jị isi buba ya bụ golu ka abatachara ezumike (46").

Ndị Chelsea emeghị ọfụma na ya bụ egwuruegwu ebe ndị otu ha niile nọ nnche na ọnụ golụ ha mgbe dum.

Ha bụ ndị onye iro gbara gburugburu nọ na-eche ndụ ha nnche onye iro banye ha ime.

Nke a mere ka ndị Manchester City nwee ohere i ji ha tiri epele n'ọgbọ.

Ndị Chelsea agbanyeghị otu bọlụ n'ọnụ golu ndị Manchester City maka na ha nọ nnche.

Ọ dịzia ka goli ndị Manchester bụ Ederson a biara ezumike.

Ihe mere n'ọgbọegwuruegwu taa gbagwojuru onyeisi ndị Chelea bụ Antonio Conte anya. Nke ka njọ bụ na ha ewerela pọint ise dachie azụ karia ndị Tottenham,mezie ka Tottenham na-agba ndị nke anọ.

Ọ bụrụ na ndị Manchester City jiri akaa, ha nwere ezigbo ohere i bute iko Premia Lig.

Isiokwu Ndị Emetụtara