PSG a ga-akpanwu ike ka Neymar anọghị n'asọmpi ha na Madrid?

Neymar, Toni Kroos, Lucas Vazquez na Nacho Fernandez Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Neymar agaghị asọmpi ọzọ ruo mgbe 'season' 2017/2018 ga-agwụ

Mmerụ ahụ onye egwu ndị Paris Saint Germain (PSG) bụ Neymar merụrụ o nwere ike ime ka-agbapụ ha n'asọmpi Champions League ha na Real Madrid ga-agba taa?

Mmekpa ahụ na-eche PSG ka ha na Real Madrid ga-asọmpi 'onye ike ga-agwụ' iji mara ma ha a ga-enweta mmeri iji gaa n'ihu na Champions League.

Real Madrid gbara ha 3-1 n'asọmpi nke mbụ, n'agbanyeghị na Neymar so gbaa egwuregwu ahụ.

Kama, ihe agbanweela maka na ahụ ọ merụrụ ka ha na Marseille sọrọ mpi nwere ike ime ka ndị otu ya taa ahụhụ ma ọ bụrụ na Madrid chịrị ọkụ bịa.

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Neymar merụrụ ahụ n'asọmpi PSG na Olympics Marseille gbara n'ụbọchị 25 nke Febụwarị 2018

Onye egwu PSG ọzọ bụ Angel di Maria ga-eduputa ndị otu ya ma ha na Real Madrid bụ ebe ọ gbaburu bọọlụ zute taa.

Di Maria enyela goolu asaa n'ime egwuregwu isii ikpeazụ ọgbarala.

Mana obi kara onye ncheazụ ha bụ Dani Alves na ha ga-emeri.

O kwuru sị "anyị nwere ike ịnọ ala bee akwa, maọbụ anyị ebilie ọtọ mee ihe anyị nwere ike ime."

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a