World Cup: Ọ fọrọ ụbọchị 100 tupu asọmpi ebido

Red Square na Kremlin Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Moscow na-akwado maka iko mbaụwa, lekwa elekere etinyere n'ihu Red Square na Kremlin na-egosi mgbada oge na ụbọchị

Taa ga-eme ya mbido ọnụọgụgụ ụbọchị 100 tupu asọmpi iko mbaụwa ebido na mba Rọshịa.

Ndị mba Rọshịa egosila nkwado ha site n'itinye nnukwu elekere na-egosi ka ụbọchị na oge na-aga n'ihu Red Square na Kremlin dị n'etiti Moscow.

A ga-agba asọmpi a site n'ụbọchị 14 n'ọnwa Juun ruo ụbọchị 15 nke ọnwa Julaị 2018.

Obi ọ dị gị ụtọ?

Ọ kwesịrị ịdị gị maka na ọ bụ nanị ụbọchị 100 fọrọ tupu o bido.

Cheta na Naịjirịa, Kroeshia, Ajentina na Aịsland nọ n'ime ofu otu.

Naịjirịa na Kroeshia ga-ebu ụzọ sọọ mpi n'ụbọchị 16 nke ọnwa Juun.

Ha na Aịsland ga-asọmpi n'ụbọchị 22 nke ọnwa Juun.

Ebe ha na Ajentina ga-ezukọ n'ụbọchị 26 nke ọnwa Juun.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: