Real Madrid agbapụla PSG na Champions League nke 2018

Cristiano Ronaldo Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Kamgbe ebidoro Champions League Cristiano Ronaldo bụ onye kachasị nye goolu

Real Madrid bụ ndị buliri iko Champions League n'afọ garaaga (2016/2017) abanyela n'agba nke anọ ka ha merichara Paris St-Germain (PSG) na be ha.

Onye egwu ha bụ Cristiano Ronaldo nyere goolu atọ n'ime egwuregwu abụọ ha gbara nke mere ka ha ji nchịkọta 5-2 merie.

Onye egwu ndị PSG bụ Neymar agbaghị bọọlụ maka ahụ ọ merụrụ, nke so mee ka ndị otu ya 'chọọ ya achọọ' maka ọdịrị egwu ọ na-eke na goolu ọ na-enyere ha.

Achụpụrụ onye egwu etiti ndị PSG bụ Marco Verratti ka egwuregwu ha na-eweta aka na nkeji 66, mere ndị otu ya ji fọrọ nanị mmadụ iri n'ọgbọ egwuregwu.

Ka ọ gbaliri Casemiro elu, enyere ya akwụkwọ edoedo, ma nye ya ọzọ ka ọ chụrụla ogbuopi gawa nke kpatara o ji nweta nke abụọ ọ ga-enweta n'ime egwuregwu ahụ, nke chịkọtara ọnụ pụta otu akwụkwọ ọbaraọbara.

Edison Cavani nyerela PSG otu goolu ebe Casemiro nyerela Real Madrid goolu ha nke abụọ.

Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Marco Verratti nwetara akwụkwọ ọbaraọbara nke abụọ ya n'ime afọ ya

Nke a ga-eme ya afọ abụọ n'usoro PSG bụ ndị nọ n'elu tebulu na Ligue 1 na-apụ n'ime agba nke 16 nke asọmpi a.

Oge ikpeazụ PSG ruru agba nke abụọ n'asọmpi a bụ n'afọ 1994/1995, ha enwegeghị ohere ịgafe agba nke anọ kamgbe ahụ.

N'aka ọzọ, nke a bụ afọ asatọ n'usoro Real Madrid na-abanye n'agba nke anọ, ebe ha ga-agba mbọ ịhụ ma ha a ga-ebulinwu iko Champions League nke atọ n'usoro.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a