Egwuregwu bọọlụ: Dịka o si gaa n'asọmpi nke taa

Rashord nyere goolu abụọ n'asọmpị ha ndị Liverpool Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Rashord nyere goolu abụọ n'asọmpị ha ndị Liverpool

Enwere asọmpi n'etiti ọtụtụ egwuregwu bọọlụ dịna mba Yuropụ dị icheiche site na mba Ingụlandị, Sụpenị, Fụransị n'akwa Jamịnị.

Ọtụtụ otu egwuregwu bọọlụ gosiri ihe ha jiri bụrụ ọka ibe, ebe ndị ọzọ gbara ọnyụpa.

Lee dịka ọ jiri gaa n'ụfọdụ asọmpị ndị ahụ na nchịkọta;

Na mba Ingụlandị, otu Manchester United ji goolu abụo asatara otu merie ndị Liverpool, Everton gbara ndị Brighton ọkpụ goolu abụọ, onweghị onye nyere goolu n'etiti ndị Huddersfield na Swansea.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọkpụ goolu iri na atọ nke Willian n'afọ a

Newcastle meriri ndị Southampton site na-inye ha goolu atọ a na-asataghị otu, Leciester jiri ọkpụ anọ asatara otu merir ndị west Brom, Burnley jir goolu atọ merie ndị West Ham, ebe Chelsea jiri goolu abụọ asatara otu merie ndị Crystal Palace.

Na mba Sụpenị, Real Madrid nyere ndị Elbar goolu abụọ asatara otu, Valencia jiri goolu abụọ merie ndị Sevilla, Levante jiri otu ọkpụ merie ndị Getafe, dịka ọ na-aga n'ịhụ ugbua Barcelona na Malaga ka na-agba.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ronaldo nyere ọkpụ goolu abụọ na mmeri ndị Real Madrid meriri Elbar

Na mba Fụransị, Paris Saint Germain jiri ọkpụ ise merie ndị Metz, ebe ndịọzọ ka na-aga n'ihu ugbu a.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Bayern tụrụugo n'asọmpi ha nke taa

A bịa na Jamịnị, Bayern Munich nyere Hamburgher ọkpụ isii, Ausburg meriri Hannover n'ọkpụ atọ asatara otu, Hertha Berlin na Freiburg emerighi ibe na nke ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara