Serena na Venus Williams ga-asọmpị n'Indian Wells

Serena na Venus Williams Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Serena na Venus Williams ga ezụkọ n'asọmpị nke nrite nke 29

Onye a ma ama n'asọmpi tenis na mba ụwa bụ Serena Williams na nwanne ya nwaanyị Venus ga-apịa n'agba nke atọ na Indian Wells.

Nke a bụ dịka Serena laghachitara kamgbe ọnwa iri na anọ ọ pụrụ ịga mụọ nwa ya nwaanyị.

Serena agbaghị tenis na ọnwa 14 ndị ahụ, mana o meriri Kiki Bertens bụ onye Nedaland 7-6 (7-5) 7-5 na agba nke abụọ ha.

"Ihe niile bụ nrite," Serena kwuru ka onwere mmeri n'ime otu elekere na nkeji iri ise na abụọ.

Nwanne abụọ a zutere n'ikpeazu n'afọ 2017 mgbe ha gbara na mgbacha Australian Open bụ mgbe Serena ritere iko Grand Slam nke iri abụọ na atọ ya.

Mgbe o meriri Venus na Melbourne, Serena di ime ada ya bụ Alexis Olympia nke ọ mụrụ n'ụbọchị mbụ nke Septemba 2017.

Asọmpị a ga abụ nke ugbo 29 ụmụnne a ga-ezụkọ n'asụmpị nrite. Serena meriri ugbo 17 n'ime ugbo 28 ha gbabugoro.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara