Lille: Ọgụ adaala n'etiti ndị ọgba bọọlụ na ndị nkwado ha

Ndị nkwado otu Lille si n'azụ onye oche bọolụ wakpo ndị ọgba bọọlụ na ngụcha asọmpi. Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị nkwado otu Lille si n'azụ onye oche bọolụ wakpo ndị ọgba bọọlụ na ngụcha asọmpi

Ndị nkwado otu Lille gbabara n'ime ọgbọ egwuregwu bọolụ ma wakpo ndị na-agbara ha bọọlụ.

Nke a mere na ngụcha asọmpi dị n'etiti ha na ndị Montpellier bụ nke ha nyeritara onwe ha otu ọkpụ goolu.

Ihe onyonyo gosiri ka ndị nkwado a na-abịa nso n'ebe ụfọdụ ndị ọgba bọọlụ nọ, bụ ndị ha malitere gbawa ụkwụ ma na-etikwa ha ọkpọ mgbe egbuchiri asọmpi ahụ.

Ndị na-ahazi asọmpị na mba Fụransị ekwuola na ha ga-enyocha ihe a mere na ọgbọ egwuregwu nke Lille Pierre-Mauroy.

"Otu LFP katọrọ ihe mere na ngụcha asọmpi ndị Lille na Montpeiller," dịka ndị nhazi asọmpi kwuru.

" Ndị na-adọ aka na ntị ga-elebara ya anya n'oge na-adịghị anya."

Lille bụ ndị mere nkeọma afọ atọ gara aga, bụ ndị na-esote ndị nọ n'ikpeazụ na teebụlụ ugbua.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara