Sevilla e kponyerala Man U aja na gari

Champions League na Sevilla Image copyright European Photopress Agency
Nkenke aha onyonyo Wissam Ben Yedder e nyela golụ asatọ na Champions League na-agba nke a

Emeri gburu ndị otu egwu bọọlụ Manchester United maka mmeri Sevilla emeriri ha unyaahụ.

Sevilla ji ọkpụ abụọ a satara otu merie ụmụ Mourinho.

Ọ tụrụ na anya ka mmeri ahụ sị bịa maka na ndị Manchester United ji ọgbọ mgbe amalitere ya bụ egwuruegwu ruo mgbe alọtachara ezumike.

Ndị Sevilla webetara otu nwaamadị ukwu na-aghọ nkọ bụ Wissam Ben Yedder.

Ya bụ onye a na-ekwu mere ihe eji kpọọ ya site na ịgbanye ọkpụ abụọ n'ọnụ goolu ndị Man U mgbe ọ dị nkeji 74 ebidochara ya bụ egwuruegwu.

A na-ekwu ka a na-ekwu, o mezụọ ya ọkpụ abụọ ihe erughị nkejị ise o tinyechara nke mbụ.

Anwụrụ malitere ịpụ ndị Man United na anya mgbe ahụ.

Ha bidoro siwe ọnwụ, lụwa ọgụ ka nkịta ara.

Mana nke ahụ bụ ụlụọnwụ ka ha na-alụ.

Image copyright Martin Rickett
Nkenke aha onyonyo Emerị mere ndị Man U unyahụ

Ha tara ahụhụ nke ukwuu ịhụ n'ihere emeghi ha na be ha, bụ ebe a na-agba asọmpi a.

Romelu Lukaku gbaara isi onwe ya site na-ịgbakpunye otu goolu n'ọnụ goolu ndị Sevilla na nkeji 84.

Nke ahụ mere ka asọmpị ahụ kụrụ ọnụ na 2-1 mere e ji chụpụ Manchester United n'egwuruegwu nke Champions League mgbe ha sọgoro mpi 16 n'agba nke a.

Manchester Unted na Tottenham ga-ala ezumike ebe ndị Manchester City na Liverpool ga-abanye agba nke anọ na Champions league.

Chelsea nwere ike i soro ha maọbụrụ na ha merie asọmpị ha na ndị Barcelona n'ụbọchị taa.

N'aka ọzọ ndị Roma jị otu ọkpụ merie ndị Shakhtar Donetsk.

Dzeko tinyere ya bụ goolu ka anatachara ezumike.

Ka ndị Shakhtar na-esi onwu ịsa ya bụ goolu, Ordets, onye otu ha gbatara mpempe akwụkwọ'red card' ejiri chụpụ ya n'egwuruegwu ahụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a