Messi enyela goolu otu narị iji gbapụ Chelsea

Messi na ndị Chelsea Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Messi dị ọkụ ka Barcelona gara ihu na Champions League

Lionel Messi nyere ọkpụ goolu abụọ ma nyere Ousmane Dembele aka inye otu ka Barcelona gbakasịrị Chelsea ahụ we merie ha 3:0 iji ruo agba nke anọ nke Champions League nke afọ a.

Na ngụkọ egwuregwu abụọ ha gbara, Barcelona jiri 4:1 merie Chelsea.

Messi nyere goolu nke mbụ n'ime nkeji abụọ egwuregwu ha ji bido, nke mere ka ọ bụrụ goolu ọkachasị nye ọsịsọ kamgbe o bidoro ịgba bọọlụ.

Goolu nke abụọ sitere na aka Messi mgbe o kpara ndị nche Chelsea atọ tupu o gbafeere Ousmane Dembele bọọlu ka o ji gbakaa goolu ndị Chelsea. Goolu Dembele bụ nke mbụ ọ na-enye kamgbe o ji bụrụ onye otu Barcelona.

Marcos Alonso kụrụ bọọlu na igwe goolu ka Olivier Giroud enweteghị penarity kwesịrị iruru ya mgbe Gerard Pique gbaturu ya tupu Messi eji goolu ya nke 100 mechie okwu.

Onye nchịkọta Chelsea bụ Antonio Conte sị na ndị nke ya kwesịrị ịgba ọfụma mana ha ebidoghị ọfụma na Nou Camp.

Nke a ga-eme ya ugboro 11 n'usoro ndị Barcelona ga-eru n'asọmpi Champions League, ebe Chelsea na-agba mbọ inweta mmeri ga-enyere ha aka ịgaru Champions League n'afọ na-abịa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara