Uefa: A ga-ama mbe ndị bụ oke n'asọmpi Uefa na Europa

A ga-agba ngụcha asọmpi Uefa n'obodo Kyiv dịna mba Ukraine Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo A ga-agba ngụcha asọmpi Uefa n'obodo Kyiv dịna mba Ukraine

Ndị na-ahazi asọmpi Uefa Champịọns ahọpụtala otu egwuregwu dị icheiche ga-ezute ibe ya n'agba kwọta faịnalụ nke asọmpi ahụ.

Iko Uefa Champịọns bụ ọkaibe nke na-esota iko mba ụwa n'iko niile gbasara asọmpi egwuregwu bọọlụ.

Nkenke aha onyonyo Otu egwuregwu ndị ga-ezute ibe ha n'asọmpi Uefa Champịọns

Anya otu egwuregwu niile a dị n'ebe iko Uefa Champịọns ahụ nọọ.

Na nhọpụta ahụ emere taa, FC Barcelona ga-ezute AS Roma, Sevilla FC na FC Bayern Munich ga-achịpụya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Juventus na Real Madrid ga-amaaka, ebe Liverpool na Manchester City ga-agba.

Asọmpi ndị ga-abụ n'abalị atọ na anọ nke ọnwa Epurelu.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Arsenal ga-ezute ndị CSKA Moscow n'asọmpi Europa

N'aka nke ọzọ ahọpụtakwara otu ga-ezute ibe ha n'asọmpi Europa.

Arsenal ga-ezute CSKA Moscow, RB Leipzig na Marseille, Athletico Madrid na Sporting Liabon ga-achịpụ ya, dịka Lazio ga-anabata Red Bull Salzburg.

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a