Otu nwoke na-akwado Chelsea awụọla na Ghana

Ndi otu egwuregwu Chelsea Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Chelsea bụ otu nwere nnukwu ndị na-akwado ha na Afịrịka

Otu nwoke aha ya bụ Emmanuel Offin bụ onye ala Ghana dara n'ala, nwụọ oge Barcelona meriri Chelsea n'asọmpị iko Champions League agbara n'ụbọchị Wenezdee 14 Maachị.

Akụkọ kwuru na mkpamkpa a mere n'obodo Kumasi, oge Offin sị ebe ọ gara ikiri asọmpị a na-alaghachị bee ya.

Ndị ezinaụlọ ya kwuru na Offin dị afọ 24 bụ onye na-akwado Chelsea ọfụma ọfụma.

Ha kwukwara na ọnwụ Offin tụrụ ha niile na-anya nke ukwu.

Chelsea apụọla n'asọmpị iko Champions League n'agba nke 16.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara