Ronaldo enyela goolu atọ n'ime otu egwuruegwu nke 50 ya

Cristiano Ronaldo Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Cristiano Ronaldo bidoro iji bọọlụ akpata ego oge ọ dị afọ 12 ka ndị otu egwuregwu Sporting CP dị na mba Pọtụgal ji £1,500 zụta ya

Cristiano Ronaldo na-agbara ndị otu Real Madrid na mba Pọtụgal bọọlụ nyere goolu atọ n'ime otu egwuregwu (hat-trick) nke ugboro 50 ya ka ha na Girona sọrọ mpi na Sụnde.

O nyere goolu anọ ka ha ji 6-3 merie Girona n'egwuregwu a mere ka ha gbagoo n'ọkwa atọ na La Liga.

Ronaldo enyela goolu 37 n'ime asọmpi niile ọ gbarala Real Madrid n'ime afọ a, tụmadụ 21 o nyere n'ime egwuregwu 11 ikpeazụ ọ gbara.

Kamgbe o jiri bido ịgba bọọlụ, Ronaldo enyerela Real Madrid goolu atọ n'ime otu egwuregwu ugboro 44, nyere ala nna ya bụ Pọtụgal ugboro ise ma nye otu oge ọ gbarala Manchester United bọọlụ.

Goolu atọ n'ime otu egwuregwu nke 50 a Ronaldo nyere ụnyaahụ mere ya nke 34 ọ na-enye na La Liga, ebe o nyerela asatọ n'asọmpi Champions League, anọ n'ime asọmpi itozu oke iko mbaụwa, abụọ n'asọmpi Copa del Rey, otu na Premier League, otu n'iko mbaụwa ndị klọb na otu n'itozu oke nke European Championship.

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ronaldo dị afọ 33 nwere ụmụ anọ nke abụọ n'ime ha bụ ejima

Site na mgbe Ronaldo bidoro iji bọọlụ akpa ego ruo n'ọnwa Mee 2017, o jirila isi ya nye goolu ugboro 27.

Ugbua a Ronaldo enyela goolu anọ n'ime otu egwuregwu ugboro itoolu kamgbe o jiri bido ịgba bọọlụ, ma nyekwa goolu ise n'ime otu egwuregwu ugboro abụọ kamgbe o bidoro iji bọọlụ akpata ego.

Isiokwu Ndị Emetụtara