Mikel, Etebo na Ajayi agaghị eso sọọ mpi na Poland

Mikel Obi nke Super Eagles Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mikel na agba bọọlụ na Tianjin Teda nke China

Ozi na-erute anyị aka na-akọwa na onyeisi otu egwu bọọlụ Super Eagles bụ Mikel Obi na ndị ọzọ bụ Junior Ajayi na Oghenekaro Etebo agaghị eso sọọ mpi enyi na enyi dị n'etiti Naịjirịa na mba Poland.

Ozi ahụ si n'ọnụ NFF kwuru na Mikel agaghị eso maka na ọ nataghị ohere n'ụlọọrụ ya.

"Anyi na-eche na Mikel ga enweta akwụkwọ ya n'oge iji gawa Poland mana etu ọ dị ugbua, ọdịghị ka ihe a ga-eme. Ọ gaghị eso n'asọmpi a," onye na-ahazi ndị Super Eagles bụ Dayo Enebi kwuru.

Nke Etebo bụ na ọ gaghị eso maka mmerụ ahụ o merụrụ mere na o soghị ndị otu ya bụ Las Palmas sọọ mpi ha na Deportivo La Coruna sọrọ na Satụdee.

Ajayi n'onwe ya enwetaghị akwụkwọ iji si London gawa Poland mana ọ ga-eso sọọ mpi nke ha na Serbia.

Ndị otu ha ndị ọzọ nọ na Poland ebidola nkwado asọmpi ha na Poland.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara