Iheanacho apụọla n'asọmpi Serbia na Naịjirịa

Kelechi Iheanacho Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo merụru ahụ n'aka

Nwaafọ Naịjirịa na-agbara ndị Leicester City bọọlụ bụ Kelechi Iheanacho na onye nchekwa bọọlụ otu egwuregwu Bursaspor bụ Shehu Abdullahi agaghị eso sọọ mpi taa ka Naịjirịa na Serbia ga ezute n'ama egwuregwu bọọlụ taa.

Onyendu ndị Super Eagles bụ Gernot Rohr kwuru na Iheanacho meruru ahụ n'aka nri ya.

Iheanacho so gbaa bọọlụ enyi na enyi Naịjirịa na Poland gbara na Wroclaw mana ewepụrụ ya tupu a gbacha.

Iheanacho bụ onye gbabụrụ otu Manchester City bọọlụ esoghị ndị ọzọ mee nkwado egwuregwu ha na Serbia.

"ịheanacho apụọla, mana ọpụpụ ya ga enye ndi ọzọ ohere ibata gosi ihe ha ga emenwu," Rohr kwuru unyaahu.

Rohr kwukwara na otu n'ime ndị oche gọọlụ ha enweteghi akwụkwọ ikike ọ ga eji banye UK, bụ ebe a ga-asọ mpi a.

"Otu nime ndi oche gọọlụ anyi nwere nsogbu akwukwọ mbata mana Ezenwa na Uzoho bụ ndị nọ n'ọgbọ ugbua na-enye m oṅu," Rohr kwuru.

Super Eagles jiri 1:0 merie Poland n'asọmpị ha gbara ụbọchị Fraịdee. A na-enwekwa olilenanya na ha ga-eme ọfụma na nke ha na Serbia taa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara