Naịjirịa na Serbia: Lee nke ga-eme n'asọmpị nke taa

Super Eagles Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Naijiria, Argentina na Croatia ga-asọmpi

Naịjirịa na Serbia ga-aso mpi enyi na enyi taa n'ama egwuregwu Hyde Park na London.

Nke a bụ mbụ ndị otu egwuregwu bọọlụ Naịjirịa bụ Super Eagles na ndị Serbia ga-ezuko n'ama egwuregwu, mana Naịjirịa na Mba Yugoslavia gbara bọọlụ na nkwado iko mbaụwa nke 1998.

Ọbu n'ime Australia ka-esi kewapụta Serbia.

Ndị Yugoslavia nyere Eagles ọkpụ goolu atọ na-asataghị otu mgbe ahụ, mana onye onụ na-eru n'okwu banyere egwuregwu bụ Emeka Offor gwara BBC Igbo na Eagles nke taa abụghị nke mgbe ahụ.

Maazi Offor sị na ndị otu Super Eagles nke taa zuru ka-eme ka ha na-ejikere nkwado iko mbaụwa.

Akụkọ ga-amasị gị:

"Moroko ka gbara Serbia otu ọkpụ goolu ha na-asataghị n'izuụka gara aga. Mana, Moroko nọ n'egwu ugbua," Offor kwuru.

Ọ gakwara n'ihu sị na ya na-ele anya na ike otu (team) abụọ a ga-abu nhatanha n'egwuregwu a.

"Naịjirịa agbaghị ọfụma n'egwuregwu ha na Poland, mana ha ji penariti merie. Serbia akwụsịghị ike n'ọgbọ ugbua, ya mere m ga-eji kwuo na Naịjirịa ga-enwe mmeri n'asọmpi a.

"Serbia agbasịghị ike ka ndị Naịjirịa," Offor kwuru.

Ndị aga-ele anya

Nemanja Matic bụ onye egwu Manchester United, bụ onye egwu Serbia ama ama.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nemanja Matic bụ onye a na-anụ aha ya na Serbia.

Victor Moses bụkwa onye aha ya na-ada ụda na Naịjirịa.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo N'agbanyeghị na-egburu nne na nna Moses na Naịjirịa, ọ na-apụta ma akpọ ya oku

Asọmpi a ga-ebido n'elekere asatọ nke taa.

Ihe ọzo ị na-amaghị

Aha otu egwuregwu bọolụ Serbia bụ 'Orlovi' nke pụtara 'Eagles' na Bekee nakwa ugo n'Igbo. Ya bụ na otu egwuregwu abụọ a na-aza otu aha.

Isiokwu Ndị Emetụtara