Iko mbaụwa 2018: Briten, Naijiria agaghị enwe referii

Howard Webb Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Howard web gburu asompi nke EPL nke Chelsea na Liverpool nke a gbara na Stamford Bridge na London nke Mikel Obi soro gba n'ọnwa Novemba 11,afọ 2012.

Fifa ahọrọla mmadụ ịrị atọ na isii maka asọmpi mbaụwa ga-eme na Rọshịa mana o nweghị onye n'ime ha si Ịngland, Skọtland, Wels maọbụ Nọden Iaịland nke a na enwe onyee Naijiria.

FIFA họrọ ndị Afrika isii n'ime ndị ga-egbu referii, ebe mmadụ iri bụ ndị nnyemaka referii sikwa Afrịka, mana onweghị nke bụ onye Naijiria.

Mark Clattenburg bụbụ sọsọ otu onye Briten nọ n'akwụkwọ ndị ọrụ Fifa nke edọkọtara n'afọ 2016, ebe e siri họrọ ndị ga-arụ ọrụ na Rọshịa.

Mana ọ hapụrụ ọrụ ya na Premia Ligi, ọnọdụ ya laa.

Clattenburg, onye rụrụ ọrụ n'asọmpị Yuro 2016 nke ikpeazụ ebe Pọtụgal meriri Fransi bụ ndị anọ be ha gba ya, hapụrụ ọrụ ya n'ọnwa February afọ 2017 ga bụrụ onyeisi ndị referii ndị Saudi Arabia.

Otu ndị bọọlụ nke Briten rịọrọ Fifa ka ha weta onye ọzọ ga-anọchi ya, mana Fifa jụrụ ajụ.

ọnweghị otu kwụrụ onye Briten so na mmadụ iri isii na atọ na-arụ ọrụ dịka ndị nyemaka referii, ebe a ga-ahọrọ ndị referii bụ ndị nnyemaka ihe nkiri n'ime ndị ọrụ ahọpụtarala maka asọmpị ahụ.

Nke a ga-abụ mbụ a ga-eji nnyemaka ihe nkiri na iko mbaụwa.

Emeghị asompi iko mbaụwa afọ iri na abụọ ka afọ 1938 gachara n'ihi Agha mbaụwa agba nke abụọ. Mana kemgbe ebidokwara ya ọzọ n'afọ 1950, a na-enwe opeka mpe, otu onye referi bụ onye Briten n'asompi ahụ.

Nwa afọ Ingland bụ Howard Webb bụ naanị onye Briten nọ n'iko mbaụwa ikpeazụ agbara n'afọ 2010 na 2014.

O gburu bọọlụ n'asọmpi ikpeazụ nke afọ 2010 mgbe Spain meriri Nedalands na Saut Afịrika.

Abịa n'akwụkwọ Fifa, ọ bụ otu bọọlụ na otu ndị referii na-ejịkọ ọnụ wepụta ndị ha chọrọ.

Akụkọ ga-amasị gị