Anthony Joshua Vs Joseph Parker: Onye bụ dike?

Anthony Joshua Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Anthony Joshua na Joseph Parker bụ ọkpọka kacha na mba ụwa ugbua

Otiọkpọ mbaụwa bụ Anthony Joshua ga-ezute Joseph Parker, n'ịma aka kacha n'afọ 2018 iji zọọ nzere atọ o nweterala; WBA nakwa IBF, IBO.

N'aka nke ọzọ, Parker na-azọ nzere WBO o nwetarala.

Ọgụ a kpụ ọkụ n'ọnụ nke a na-atụ anya na mmadụ 78,000 ga-ekiri ya ga-eme n'abalị echi bụ Satọde n'ama egwuregwu Principality dị na Cardiff nke mba Britein.

Nke bụ mbụ ọkaibe azụ erụala mba ụwa abụọ ga-ezute onwe ha n'ọgụ onye ọbụla n'ime ha merri ga-eji nzere atọ a;WBO,WBA, na IBF, la.

Ka nke a na-eme, n'otu ọgụ a, Joshua Buatsi, onye nke a mụrụ n'ala Ghana ma na-etiri Briten ọkpọ ga-ezute Bartlomiej Grafka onye si mba Poland.

Buatsi onye nwetara mba Briten nturuugo 'bronzu' na Olympics for bụ onye Ghana ebe Joshua bụ onye Naijiria aha ya bụ Oluwafemi.

Ihe AnKwesiri ma maka ha:

Joseph Parker

1. Parker dị afọ iri abụọ na isii alụọla ọgụ iri abụọ na anọ ma meriricha ha niile kemgbe o jiri were itiọkpọ dịka ọrụ

2. Ọ lụrụ ọgụ ya ikpeazụ n'ọnwa Septemba afọ 2017 oge ya na Hughie Fury kwatara n'ọgụ o jiri zọrọ nzere WBO dịka ọkaibe

3. O bidoro iti ọkọ na nwata ka ọ dị afọ ise dịka nna ya na-azulite ya n'ihe gbasara iti ọkpọ

4. Ebe Parker si eri mperi bụ na ndị dọkịta gwara ya bụ nwa amadị mba onye Nu Ziland aka iji kwụsị ahụ ụfụ ọ na-enwe ma ọ na-eti ọkpọ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Joshua na Parker enwebeghị onye n'ime ha emeriri n'ọgụ

Anthony Joshua

1. Joshua dị afọ iri abụọ na asatọ alụọla ọgụ iri abụọ, meririchara na iri abụọ ndị ahụ, kemgbe nwa amadị ahụ jiri were itiọkpọ mere ọrụ

2. Ọ lụrụ ọgụ ya ikpeazụ n'ọnwa ọctober afọ 2017 oge ya na Carlos Takam kwatụrụ nke ọ jiri zọọ nzere IBF ya

3. Joshua kara ị ga mkpọrọ oge maka itinye aka n'anwụrụ ike mana site n'ebere onye ọkaikpe na enyemaka onye nchịkọta ya bụ Sean Murhpy, chi ya nyere ya ohere ọzọ iza mmadụ

4. Ndị mara ihe a na-ekwu n'itiọkpọ kwuru na ebe Joshua si eri mperi bụ n'agba ya. Ha kwuru na akaekpe ya anaghị aga ọsọọsọ mgbe o ji ya enye ọkpọ nke mere ka onye iro ya nwe ike inweta agba ya.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a