Chelsea nwere ike iji ndị nchịkọta ise a dochie Antonio Conte

Ka Tottenham gbachara Chelsea 3-1 na be ha, onye nchịkọta ha bụ Antonio Conte ekwuola na ọ dị njikere ma a chọọ ịchụ ya n'ọrụ.

Antonio Conte
Nkọwa foto,

Ọdịnihu onye na-achịkọta otu Chelsea bụ Antonio Conte abụghị ihe e ji aka ugbua. Mana onye nwere ike ịnọchi ya dịka onye nchịkọta?

Nkọwa foto,

Mauricio Pochettino bụ onye nchịkọta Tottenham ugbua. Ọ bụ ndị otu ya gbara Chelsea 3-1 n'ụbọchị Sụnde nke na-enye Conte isi ọwụwa n'ụtụtụ a. Akụkọasịrị apụtala ọtụtụ oge na onye nwe Chelsea bụ Roman Abramovic na-etinye anya ebe ọ nọ.

Nkọwa foto,

Massimillano Allegri bụ onye nchịkọta otu Juventus ebuliela iko Serie A ugboro abụọ sotere ibe ya ma sorokwa gbaa ngwụcha asọmpi Champions League ugboro abụọ nke gụnyere 2016/17. O teela aka a na-ekwu na o nwere ike ịgafe England.

Nkọwa foto,

Roberto Mancini bụ otu onye nchịkọta ma ihe a na-akọ gbasara asọmpi premier league nke o gosiri site n'ibuli iko ya n'afọ 2011/12 oge ọ na-elekọta Manchester City.

Nkọwa foto,

Luis Enrique buliri iko atọ n'ime afọ mbụ ọ bụ onye nchịkọta otu Barcelona. Ka ọ na-enweghị ọrụ ọbụla ugbua, enwere ike itinye anya ebe ọ nọ.

Nkọwa foto,

Thomas Tuchel bụbu onye nchịkọta otu Borussia Dortmund, so n'otu n'ime ndị nwere ike ịnọchi Conte. Tuchel agwalaarị Bayern Munich na ọ chọghị ịbụ onye nchịkọta ha.