Asọmpi Uefa Champịọns atabirila ọkụ

Asọmpi Uefa Champịọns 2017/2018 nke agba kwọta faịnalụ ga-amalite taa
Nkọwa foto,

Asọmpi Uefa Champịọns 2017/2018 nke agba kwọta faịnalụ ga-amalite taa

Otu egwuregwu ndị gbapụtara ihe na mba Yurope na-ejikere maka asọmpi agba kwọta faịnalụ nke Uefa Champịọns.

Ndị otu ga-amalite asọmpị nke taa bụ Juventus ga-ele Real Madrid ọbịa ma ọfọdụ nkeji iri na ise ka ọ kụọ elekere asatọ nke abalị a.

Nkọwa foto,

Otu Real Madrid na-ejikere maka asọmpi ahụ

N'otu aka ahụ Sevilla na Bayern Munich ga-ezute ibe ha na mba Spenị.

Oge gara aga mgbe ndị Juventus zutere Real Madrid bụ n'agba nke ikpeazụ n'afọ 2017.

Nkọwa foto,

Gonzalo Higuain na Paulo Dybala ndị otu Juventus

Madrid jiri ọkpụ anọ asatara otu merie Juventus, iji mabute iko Uefa Champịọns.

A na-atụ anya na Juventus ga-akwụ ndị Real Madrid ụgwọ ihe emere ha n'oge gara aga.

Nkọwa foto,

Ndị Bayern na-akwado izute otu Sevilla

Ndị a na-atụ anya ga-eme nkeọma n'asọmpị taa gunyere Cristiano Ronaldo, Karim Benzema.

Ndị ọzọ gunyere Gonzalo Higuain, Paulo Dybala, Robert Lewandoski n'akwa Wissam Ben yedder.

Nkọwa foto,

Sevilla bụ otu egwuregwu bọọlụ dị na mba Spenị

Akụkọ ga-amasị gị