Ronaldo egosịla ihe o jiri bụrụ onye egwu a na-atụ ụjọ

Cristiano Ronaldo Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Cristiano Ronaldo enyela goolu na asọmpị 10 kwụ onwe ya n'azụ

Cristiano Ronaldo nyere goolu eji amaatụ ụnyahu ka Real Madrid gbakarụ Juventus ahụ n'agba nke ato nke Champions League mgbe ọ gbara ọnụ goolu azụ were nye ya bụ goolu na ihe ndị Bekee na-akpọ "bicycle kick".

N'asọmpị ahụ, Ronaldo pụtara ka onye mbụ nyere goolu na asọmụnpị Champions League 10 so onwe ha na azụ.

Ndị Juventus nwere ohere i nye goolu nke ha na ọkara nke mbụ na asọmpị ahụ, agbanyeghị na ọfọrọ obele ka Toni Kroos enyekwara ndị Madrid goolu mgbe bọọlu ya kpịara na igwe goolu.

Mana, oge ruru mgbe Dani Carvajal gbanyere bọọlu elu nye Ronaldo, bụ onye wulịlị elu were jiri ike nye goolu Gianluigi Buffon, bụ nche goolu Juventus, ahụhụ anya.

Goolu ahu dị egwu, nke mere ndị otimkpu Juventus were kulie ọtọ nye Ronaldo ekene.

Marcelo mechiri akwụkwọ mgbe o pịanyere bọọlụ Ronaldo nyere ya na goolu.

Isiokwu Ndị Emetụtara