France 8 Super Falcon 0

Iko mba Afrika nke ụmụnwaanyị Image copyright NFF/twitter
Nkenke aha onyonyo Nke a bụ ugboro abụọ ndị France na-emeri ndị Falcons

Ụmụnwaanyị egwu bọlụ nke Naịjirịa bụ Super Falcons na nke ndị France sọrọmpi enyi na enyi ụnyahụ bụ Fraide.

Ya bụ mpi ha sọrọ kpọrọ ndị super Falcons ihụ ọjọọ site na ịgba ha ọkpụ asatọ chara acha na ọgbọ egwuruegwu MMArena na Le Mans, nke France.

Mpi ha sọrọ bụ nke enyi na enyi maka nkwado egwuruegwu ụmụnwaanyị mba Afrika nke 2018.

Ihe a bụ ụkwụ egwụ mbụ onye nkuzi ha bụ Thomas Dennerby nke Sweden tụrụ.

Nke a bụ ugboro abụọ ndị France na-emeri ndị Falcons.

Akukọ ndị ga-amasị gị:

Nke mbụ bụ na iko mba ụwa nke ụmụnwaanyị nke agbara na Germany na 2011 bụ nke ha ji otu (1 - 0)ọkpụ were merie ha.

France bidoro ozigbo amalitere ya bụ egwuruegwu chawa ọkụ nke bụ na ha chọrọ itiney otu golu na nkeji iri na anọ (nkeji 14) mana Chiamaka Nnadozie ekweghị ekwe.

Okụ ndị France na-acha mịtara mkpụrụ na nkeji nke iri itoolu (nkeji 9) mgbe nwaada Eugenie Le Sommer tinyere ofu n'ọnụgolu.

Mgbe ọ banyere nkeji iri abụọ na isii (nkeji 26) ritere akwụkwọ edo maka arụrụala ọrụsara onye France.

Tupu ezụmike erụọ, France agbakanyela golụ atọ n'ọnụ gola ndị Super Falcons.

Ka anatachara ezumike (nkeji 54 ), Desire Oparanozie yiri ha egwu site na pịawanyere bọlụ dị ọkụ na golu ndị France mana golii ha egweghị ekwe.

Egwu Oparanozie menyere ha pụrụ ha n'anya mgbe onye otu ha bụ Aminata Dilalo tinyere golu ọzọ na ọnụgọlu ndị Super Falcon.

Golu ọzọ nke Gauvin nyere sochiri azụ na nkeji 70 iji mezue ya ọkpụ ise ndị Falcon ji na-ụkwọ.

Ha kabakwara ahụ imezụ ya ọkpụ asaa tinyere nke Faith Ikidi jị aka ya nye onwe ha bụ nke mezuru ya ọkpụ asaa.

Tupu egwuruegwu ahụ abia n'isi njedebe, Marie-Charlotte Leger gbara mbọ tinye ofu golu ọzọ nke mezuru ya asatọ.

Isiokwu Ndị Emetụtara