Asọmpi Commonwealth: Naịjirịa agafeela n'agba ọkara-ikpeazụ nke tenisi

Ndị mba Afrịka na-egosi ike ha n'asọmpi Commonwealth a na-eme na mba Australia.
N'agbanyeghị na Naịjirịa enwetebeghị ihe nrite ọlaedo, ọlaọcha maọbụ ọlanchara ọbụla kamgbe asọmpi nke 2018 a ji bido, olileanyị dị n'oge na-adịghị anya.
Ụmụ Naịjirịa bụ Segun Toriola na Olajide Omotayo ji 3-1 merie Australia n'agba kwọta faịnal nke asọmpi tebulu tenisi, nke mere na ha ga-ezute England n'agba semi-faịnal na Monde.
Ọ bụrụ na Toriola na Omotayo merie, ọ pụtara na ha ga-eso sọọ mpi nke ngwụcha nke ga-eme ka Naịjirịa nweta ihe nrite ha nke mbụ n'asọmpi nke afọ a.
Akụkọ ga-amasị gị
- Ohi Kwara: Ndị uweojii anwụchiela mmadụ 7
- 'Social media' enwurula ọkụ maka Aisha Wakil
- France mere Super Falcon ịwa
Obi dị ndị Naịjirịa mma maka nke a.
N'ịkụ ọkpọ
Apịapụla otu onye na-anọchite Naịjirịa n'ọkpọ.
Samuel Addo bụ onye mba Ghana pịapụrụ Sikiru Ojo ka ha abụọ zutere n'agba nke bekee kpọrọ Bantam weight (56kg).