Etu Man Utd si napụ Man City ike

Man U Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị Man Utd na-enwe anụrị oge e gbuchiri bọọlụ

Ndị Man Utd mere ndị na-akwado Man City echeta ebewe site na mmeri ha meriri ha ụnyaahụ.

Ka ebidoro egwuregwu a, ndị na-akwado Man City chere na ọ bụ naanị imezu iwu ma ha gbazuo nkeji 90, maka n'obi ha, ha chere na ha emeriela ndị Man Utd ka ha ji abụọ asatghị ihe (2-0) na-aga ha.

Ha ji anwụrụ ọkụ na-acha anụnụ anụnụ (blue smoke) mechie elu ebe ndị na-akwado mmadụ na-anọdụ ala, ha kwara ndị otu Man Utd na ndị na-akwado ha emu ka Vincent Kompany na Ilkay Gundogan nyere goolu abụọ n'ọkara nke mbụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị na-akwado Man City tụbatara anwụrụ ọkụ anụnụ a n'ọgbọ egwuregwu

Goolu abụọ Paul Pogba nyere n'ime nkeji abụọ (nkeji 53 na nkeji 55) iji saa nke Man City so kpalite mmụọ ndị Man Utd, mee ka ha kwenye na ha nwere ohere iji merie egwuregwu ahụ.

Chris Smalling mere ihe gụrụ ụfọdụ ndị nkwado Man City akwa ka ọ gbanyere goolu nke atọ na nkeji 69.

Iwe were ndị Man City ka onye na-egbu bọọlụ bụ Martin Artkinson jụrụ inye ha penariti ka Ashley Young bụ onye Man Utd gbaturu onye nke ha bụ Sergio Aguero, oge ha na-achụ ịsa goolu nke atọ.

Onye na-echere ndị Man Utd bọọlụ bụ David de Gea gosipụtara ihe o jiri bụrụ dike ka o si chee goolu Aguero chọọrọ iji saa ha, tupu egbuchie bọọlụ na nkeji 90.

Na Man Utd meriri ha agaghị akwụsị Man City ibuli iko Premier League nke afọ a, maka na ha ji pọintị 13 aga Man Utd bụ ndị na-eso ha n'azụ.

Iko a ha ga-ebuli, ga-eme ya iko premier league nke atọ ha na-ebute.

Man City ga-ezute Liverpool ọzọ na Champions League n'ụbọchị Tuusde, kama ọ ga-ara ha ahụ maka na Liverpool ji goolu atọ merie ha n'agba nke mbụ ha gbara n'izu gara aga.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a