Ndị Katọlik na-eme ụka nne taa

Ndị nne ụka Katọlik
Nkenke aha onyonyo Ụka nne bụ emume ndị ụka Katọlik ji akwanyere ndị nne ugwu n'ụzọ pụrụ iche

Ndị jịkọtara aka ọnụ chịkọba mmemme dị iche iche ịjị wee nwee aṅụrị na ụbọchị ndị nne abịakwala ọzọ.

N'ụka a kara ndị nne na St Michaels Asata Enugwu, ụbọchị ụka, ndị ụkọchukwu;Fada Callistus Ani na Wilfred Agu kọwara na nne bụ ndị nwere obi umeala ma na ekpokọba ezinaụlọ ha ọnu.

Na Holy Ghost Cathedral dịkwa n' Enugwu, Rev. Fr. Peter Acharakpọkuru ndị nna na ụmụaka ka ha gharakwa iji ndị nne gwuo egwu ma ncha.

Achara toro ndị nne dịka ndị anaghị ekwe ka ọkụ ọbụla a gụnyere ha na-aka nyụọ.

O nyere ọmụmatụ sị na ọ bụ ndị nne jị uka, ma na-ahụ na udo na mbawanye dị na ụwa.

Nkenke aha onyonyo Ndị Katolik na Naijiria na-eme ụka nne na-apụta na oge Lent

Ndị nne St. Micheals Asata guzobere mmemme dị iche iche dika, ịkwụ n'ahịrị zọ njem ka ndịagha, asọmpị onye nne ka mma nakwa ịwa achịcha bekee.

Ndị otu ndị nne nke a kpọrọ CWO nke Holy Ghost Cathedral jị aka ha mee mmemme niile dị na ịka ụka tata ka e were mee ya bụ mmemme.

Onyeisi ndị nne Holy Ghost bụ Patricia Achara n'onyeisi ndị nne St Michaels Asata dị n' Enugwu gwara ndị ha ka ha were ụbọchị tata malite ibi ezigbo ndụ nke na ndị agbataobi ha nile ga-ama na ha bụ ezigbo nne na-atụ egwu Chineke.

Nkenke aha onyonyo E jiri ọtụtụ ụzọ sị ọṅụ na mmeme ndị nne

Fada Achara jịkwa ohere ahụ kpere ndi nne na-achọ mkpụrụ nke afọ ekpere ka ha mụta nwa.

Ụka nne bụ mmemme ndị ụka Katọlik na-eme kwa afọ ịjị kwanyere ndị nne ugwu dịka ide jị ụka.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionChioma Akpotha: Ugwu ka e jiri mara nwaanyị Afrịka

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a