Ka o si gaa n'asọmpi agbara ụbọchị ụka

Welbeck nyere goolu abụọ n'ime asọmpi ahụ Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Welbeck nyere goolu abụọ n'ime asọmpi ahụ

N'ezie taa dịka ngwụcha izuụka n'egwuregwu bọọlụ, otu dị icheiche zutere ibe n'asọmpi iko dị icheiche.

Otu ndị a gụnyere ọtụtụ ndị nọ na mba Yurop nakwa Afrịka, dịka ụfọdụ turu ugo, ebe ndị ọzọ mara afọ n'ala.

Na mba England, Arsenal jiri ọkpụ atọ asatara abụọ merie ndị Southampton, ebe Chelsea na West Ham nyeritara onwe ha otu ọkpụ goolu.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ronaldo nyere goolu n'ime asọmpi iri nke ndị Real Madrid na-esepụghị aka

Na mba Spen, Real Madrid na ogbo ha bụ Athletico Madrid jiri otu okpụ otu ọkpụ kwe onwe ha n'aka, ebe Levante jiri ọkpụ abụọ merie ndị Las Palmas satara otu.

Real Sociedad mechuru ndị Girona ihu site n'ọkpụ ise asataghị otu.

N'Itali, Napoli ji ọkpụ abụọ asatara otu merie ndị Chievo Verona, Torino meriri Inter milan, Lazio meriri Udinese bụ ndị satara otu goolu n'ime abụọ.

Na Jamịnị, Dortmund jiri ọkpụ atọ merie ndị VfB Stuttgart, Eintracht Frankfurt na Hoffenhei, nyeritara onwe ha otu ọkpụ.

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Hernandez enyela ndị chelsea goolu itoolu kamgbe ọgbawara bọọlụ

Na Fransị, Lyon nyere Metz ọkpụ ise chara acha, Nice na Rennes nwetara otu ọkpụ otu ọkpụ.

A bịa n'Afrịka n'ime itozu oke asọmpi CAFCC, otu Djoliba nke Mali jiri otu ọkpụ merie ndị MFM nke Naịjirịa.

Na Naịjirịa, Kano Pillars na Wikki Tourist kere ọnwe ha otu ọkpụ, Enugu Rangers meriri Niger Tornadoes n'otu ọkpụ.

Ifeanyi Uba jiri goolu atọ asatara otu merie ndị Sunshine Star, Yobe Stars meiri Go Round site n'otu ọkpụ.

Abia Warriors na ndị Heartland enweghị ndị nyere ibe ha goolu, ebe Katsina United jiri ọkpụ abụọ asatara otu merie ndị Rivers United.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a